Daniel 1

Ọzụzụ Daniel na Babilọn

1Mgbe afọ atọ gafere site na mgbe Jehoiakim bidoro bụrụ eze na-achị Juda, Nebukadneza eze na-achị Babilọn bịara buso Jerusalem agha. 2Onyenwe anyị nyefere Jehoiakim, eze Juda nʼaka ya, na ihe ụfọdụ e jiri chọọ ụlọnsọ Chineke mma. O buuru ha niile gawa Shaịna nʼụlọ chi ya, dobe ha nʼime nʼụlọakụ chi ya.

3Eze nyere Ashipenaz, onyeisi ndị ozi ya iwu ka ọ kpọbata ụmụ okorobịa sitere nʼezinaụlọ eze na nke ndị ọchịchị nʼala Izrel nʼije ozi eze. 4Ụmụ okorobịa ndị a ga-abụ ndị nʼenweghị nkwarụ ọbụla nʼahụ ha, ndị mara mma ile anya na ndị nwere nghọta banyere ihe ọmụma dị iche iche. Ha kwesikwara ịbụ ndị maara ihe, ndị na-amụta ihe ọsịịsọ na ndị tozuru oke ije ozi nʼụlọeze. Ọ ga-akụziri ha asụsụ na akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche nke ndị Kaldịa. 5Onye eze si nʼoche nri ya na-ewepụta nri na mmanya a ga-enye ha kwa ụbọchị. Ha ga-anọ nʼọzụzụ a afọ atọ, nke ọ ga-abụ e mechaa, ha ga-abụ ndị kwesiri ịnọ nʼije ozi nʼobi onye eze.

6Ndị so nʼime ha bụ Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya, ha bụ ndị Juda. 7Ma onyeisi ndị na-ejere eze ozi nyere ha aha ọhụrụ ọzọ Daniel ka ọ kpọrọ Belteshaza; Hananaya ka ọ kpọrọ Shedrak; ọ kpọrọ Mishael, Mishak; kpọkwa Azaraya, Abednego.

8Ma Daniel kpebiri nʼobi ya na ọ gaghị emerụ onwe ya site nʼiri nri maọbụ ịṅụ mmanya eze. Ya mere ọ rịọrọ onyeisi ndị ozi ka ọ hapụ ya ka ọ ghara imerụ onwe ya. 9Ma Chineke mere ka Daniel nweta ihuọma na obi ebere nʼaka onyeisi ndị na-ejere eze ozi. O nwekwara ọmịiko nʼebe Daniel nọ nʼihi ọnọdụ ha. 10Ma onyeozi a gwara Daniel, “Ana m atụ egwu nʼihi onyenwe m eze, onye kwuru ihe unu ga-eri na ihe unu ga-aṅụ. Ọ bụrụ na ọ hụ na unu tara ahụ karịa ndị ọgbọ unu ndị ọzọ, ndụ m ga-anọ na nsogbu nʼaka onye eze.”

11Daniel sịrị onyeisi ahụ e tinyere ọrụ ilekọta Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya nʼaka, 12“Biko, nye anyị naanị ahịhịa nri, na mmiri ọṅụṅụ, ka ọ bụrụ ihe oriri anyị na ihe ọṅụṅụ anyị. Jiri ya lee anyị ule ụbọchị iri. 13Jirizie anya gị chọpụta ma o nwere ihe dị iche nʼetiti anyị na ndị ọzọ, ndị na-eri nri ọma nke eze nyere, site nʼihe ị hụrụ, mee ụmụodibo gị otu o kwesiri.” 14O kwenyere ime ihe ha kwuru, ọ nwalere ha abalị iri.

15Mgbe ụbọchị iri ahụ zuru, a chọpụtara na ahụ dị ha mma, chọpụtakwa na ha dị mma ile anya karịa ụmụ okorobịa ndị ọzọ e ji nri ọma niile eze nyere zụọ. 16Ya mere onyeisi ozi ahụ wepụrụ nri na mmanya ọma ahụ ha kwesiri iri ma nye ha naanị akwụkwọ nri.

17Chineke mere ka ụmụ okorobịa anọ ndị a nwee ọgụgụisi pụrụ iche na nghọta nʼihe ọbụla gbasara edemede na amamihe niile. Daniel nwekwara nghọta ịkọwa ụdị ọhụ niile na nrọ niile.

18Mgbe oge eze nyere a ga-eji kpọbata ha nʼije ozi ya zuru, onyeisi ndị na-eje ozi chere ha nʼihu Nebukadneza. 19Ha na eze kparịtakwara ụka. Ma nʼime ụmụ okorobịa ahụ niile a zụrụ, o nweghị nke amamihe ya juru eze afọ dịka amamihe Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya. Nʼihi nke a, o mere ka ha soro bụrụ ndị na-adụ ya ọdụ. 20Mgbe ọ bụlakwa eze chọrọ ndụmọdụ banyere amamihe na nghọta, ọ na-achọpụta na ndụmọdụ ha na-enye ya na-adị mma okpukpu iri karịa ndụmọdụ nke ndị majiki ya na ndị maara ihe banyere kpakpando nọ nʼalaeze ya na-enye ya.

21Daniel nọgidere bụrụ onye na-adụ eze ọdụ tutu ruo afọ mbụ nke Sairọs bidoro ịchị dịka eze.

Copyright information for IboBIU